2O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn.
3Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko.
4Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị.
5Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke.
6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.