15Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.”
16Pọl guzoro ọtọ nʼetiti ha feere ha aka ya, sị, “Unu ndị Izrel na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị.
17Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ.
18Ọ nagidere ha iri afọ anọ nʼime ọzara.
19O bibiri mba asaa dị ukwuu nʼime ala Kenan nʼihi ha, nyekwa ndị ya obodo a ka ọ bụrụ nke ha.