23“Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite.
24Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị.
25Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’
26“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile.
27Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ.