Ọrụ Ndị Ozi 13

Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị.

Acts 13:44 (UKJV) And the next sabbath day came almost the whole city together to hear the word of God.

42Mgbe Pọl na Banabas na-apụ, ndị mmadụ rịọrọ ha ka ha bịakwa nʼizu ụka ọzọ gwa ha okwu gbasara ihe ndị a.

43Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke.

44Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị.

45Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu.

46Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.