Ọrụ Ndị Ozi 13

Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ.

Acts 13:46 (UKJV) Then Paul and Barnabas waxed bold, and said, It was necessary that the word of God should first have been spoken to you: but seeing all of you put it from you, and judge yourselves unworthy of everlasting life, lo, we turn to the Gentiles.

44Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị.

45Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu.

46Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ.

47Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu, “ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’”

48Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.