Ọrụ Ndị Ozi 13

Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.

Acts 13:5 (UKJV) And when they were at Salamis, they preached the word of God in the synagogues of the Jews: and they had also John to their minister.

3Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.

4Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs.

5Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.

6Mgbe ha gazuchara obodo niile ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ruo Pafọs, ha zutere otu onye mgbaasị, onye Juu bụ onye amụma ụgha a na-akpọ Ba-Jisọs.

7Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.