1Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl.
2Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.”
3Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.
4Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs.
5Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.