14Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu,
15na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha.
16Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha.
17Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.”
18Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.