15na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha.
16Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha.
17Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.”
18Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.
19Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla.