23Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya.
24Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia.
25Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia.
26Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru.
27Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ.