26Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru.
27Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ.
28Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.