Ọrụ Ndị Ozi 15

Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”

Acts 15:1 (UKJV) And certain men which came down from Judaea taught the brethren, and said, Except all of you be circumcised after the manner of Moses, all of you cannot be saved.

1Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”

2Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a.

3Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.