Ọrụ Ndị Ozi 15

Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”

Acts 15:11 (UKJV) But we believe that through the grace of the LORD Jesus Christ we shall be saved, even as they.

9O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe.

10Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ?

11Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”

12Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ.

13Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.