Ọrụ Ndị Ozi 15

E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a.

Acts 15:24 (UKJV) Forasmuch as we have heard, that certain which went out from us have troubled you with words, subverting your souls, saying, All of you must be circumcised, and keep the law: to whom we gave no such commandment:

22Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna.

23Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele.

24E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a.

25Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas,

26ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.