Ọrụ Ndị Ozi 15

Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.

Acts 15:39 (UKJV) And the contention was so sharp between them, that they departed asunder one from the other: and so Barnabas took Mark, and sailed unto Cyprus;

37Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa.

38Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha.

39Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs.

40Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị.

41O jegharịrị nʼime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ nọ nʼebe ahụ ume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.