20Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,
21site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.”
22Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe.
23Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma.
24Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ.