32Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị.
33Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim.
34Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
35Nʼechi ya, ndị ikpe ahụ zitere ndị uweojii sị, “Hapụnụ ụmụ nwoke ahụ ka ha laa.”
36Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”