Ọrụ Ndị Ozi 16

Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.

Acts 16:38 (UKJV) And the sergeants told these words unto the magistrates: and they feared, when they heard that they were Romans.

36Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl, sị, “na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ugbu a pụtanụ. Unu laanụ nʼudo.”

37Ma Pọl sịrị ha, “Ha tiri anyị ihe nʼihu mmadụ niile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nʼụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nʼobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesiri ka ha bịa nʼonwe ha kpọpụta anyị.”

38Ndị uweojii ahụ gara gwa ndị ikpe ahụ ihe ha kwuru. Mgbe ha nụrụ na ha bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.

39Ha bịakwutere ha rịọsie ha arịrịọ ike. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ.

40Mgbe ha sitere nʼụlọ mkpọrọ pụta, ha gara nʼụlọ Lidia. Nʼebe ahụ ka ha zutere ụmụnna, gwa ha okwu mgbamume, emesịa ha si nʼobodo ahụ pụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.