Ọrụ Ndị Ozi 17

Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara.

Acts 17:12 (UKJV) Therefore many of them believed; also of honourable women which were Greeks, and of men, not a few.

10Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu.

11Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile.

12Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara.

13Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara.

14Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.