22Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.
23Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu.
24“Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo.
25Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile.
26O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha.