Ọrụ Ndị Ozi 17

Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”

Acts 17:31 (UKJV) Because he has appointed a day, in the which he will judge the world in righteousness by that man whom he has ordained; whereof he has given assurance unto all men, in that he has raised him from the dead.

29“Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ.

30Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.

31Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”

32Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”

33Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.