30Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.
31Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”
32Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”
33Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha.
34Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.