32Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”
33Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha.
34Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa.