Ọrụ Ndị Ozi 18

Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe.

Acts 18:12 (UKJV) And when Gallio was the deputy of Achaia, the Jews made insurrection with one accord against Paul, and brought him to the judgment seat,

10Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.”

11Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke.

12Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe.

13Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.”

14Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.