8Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.
9Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị.
10Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.”
11Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke.
12Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe.