6Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.”
7O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
8Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.
9Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị.
10Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.”