Ọrụ Ndị Ozi 18

Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.”

Acts 18:15 (UKJV) But if it be a question of words and names, and of your law, look all of you to it; for I will be no judge of such matters.

13Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.”

14Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo.

15Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.”

16O sitere nʼime ụlọ ikpe ya chụpụ ha.

17Ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ tie ya ihe nke ukwuu nʼọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dịka ọ maara ihe na-eme nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.