Ọrụ Ndị Ozi 18

Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha,

Acts 18:2 (UKJV) And found a certain Jew named Aquila, born in Pontus, lately come from Italy, with his wife Priscilla; (because that Claudius had commanded all Jews to depart from Rome:) and came unto them.

1Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint.

2Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha,

3nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu.

4Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.