Ọrụ Ndị Ozi 18

Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

Acts 18:5 (UKJV) And when Silas and Timotheus were come from Macedonia, Paul was pressed in the spirit, and testified to the Jews that Jesus was Christ.

3nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu.

4Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere.

5Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

6Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.”

7O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.