Ọrụ Ndị Ozi 19

Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?”

Acts 19:15 (UKJV) And the evil spirit answered and said, Jesus I know, and Paul I know; but who are all of you?

13Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.”

14Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu.

15Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?”

16Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ.

17Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.