14Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu.
15Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?”
16Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ.
17Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile.
18Ọtụtụ ndị kwenyerenụ bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha niile, nʼihu mmadụ niile.