Ọrụ Ndị Ozi 19

Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”

Acts 19:28 (UKJV) And when they heard these sayings, they were full of wrath, and cried out, saying, Great is Diana of the Ephesians.

26Unu niile ahụla ma nụkwa, otu nwoke a na-akpọ Pọl si rafuo ọtụtụ ndị mmadụ site nʼime ka ha kwenye na chi ọbụla e ji aka mee abụghị chi. Ọ bụkwaghị naanị nʼEfesọs kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ nʼEshịa niile.

27Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.”

28Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”

29Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.

30Pọl chọrọ ịbakwuru igwe mmadụ ahụ, ma ndị na-eso ụzọ ahụ ekweghị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.