Ọrụ Ndị Ozi 19

Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.

Acts 19:29 (UKJV) And the whole city was filled with confusion: and having caught Gaius and Aristarchus, men of Macedonia, Paul's companions in travel, they rushed with one accord into the theatre.

27Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.”

28Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”

29Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ.

30Pọl chọrọ ịbakwuru igwe mmadụ ahụ, ma ndị na-eso ụzọ ahụ ekweghị ya.

31Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.