Ọrụ Ndị Ozi 19

Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ.

Acts 19:33 (UKJV) And they drew Alexander out of the multitude, the Jews putting him forward. And Alexander beckoned with the hand, and would have made his defence unto the people.

31Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya.

32Ugbu a, nzukọ ahụ na-agba aghara, ụfọdụ mmadụ na-eti mkpu otu ihe, ndị ọzọ na-eti ihe ọzọ. Nʼezie, ọtụtụ nʼime ha amatakwaghị ihe ha jiri nọdụ nʼebe ahụ.

33Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ.

34Ma nʼotu ntabi anya ahụ, mgbe ha matara na ọ bụ onye Juu, ha bidoro iti mkpu ihe dịka ogologo awa abụọ na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!”

35Nʼikpeazụ, ode akwụkwọ nke obodo ahụ kwụsịrị igwe mmadụ ahụ ime ụzụ. O kwuru, “Ndị ikom Efesọs, o nwere onye na-amaghị na obodo Efesọs bụ obodo na-echekwa ụlọ ofufe Atemis, na oyiyi ya nke si nʼeluigwe daa?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.