36Ebe ihe ndị a adịghị na ngọpụ, ọ dị mkpa ka unu nọdụ nwayọọ, ghara imebi ihe ọbụla nʼecheghị echiche.
37Lee ugbu a, ndị a unu kpọtara nʼebe a abụghị ndị ohi, ndị na-ezuru ihe nʼogige chi anyị, maọbụ na-ekwutọ eze nwanyị arụsị anyị.
38Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ọkpụ ụzụ ibe ya nwere ihe ọbụla megide ha, ha gaa nʼụlọikpe. Ndị na-ekpe ikpe ga-eleba okwu ha anya. Kama ha mee ya nʼusoro iwu kwadoro.
39Ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ dị iche unu chọrọ ka e mee, a ga-edozi ya na nzukọ nke ndị obodo na-eme nʼụzọ ziri ezi.
40Nʼihi na egwu dị, na-eleghị anya a ga-eji ihe nke mere taa boo anyị ebubo na anyị na-ebute ọgbaaghara. Anyị enweghị ọsịsa ziri ezi banyere ọgbaaghara nke a.”