Ọrụ Ndị Ozi 2

Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,

Acts 2:16 (UKJV) But this is that which was spoken by the prophet Joel;

14Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu.

15Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ.

16Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,

17“ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.

18Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.