15Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ.
16Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,
17“ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
18Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.
19Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ.