Ọrụ Ndị Ozi 2

“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.

Acts 2:22 (UKJV) All of you men of Israel, hear these words; Jesus of Nazareth, a man approved of God among you by miracles and wonders and signs, which God did by him in the midst of you, as all of you yourselves also know:

20Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.

21Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’

22“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.

23Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu.

24Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.