18Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.
19Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ.
20Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
21Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’
22“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.