Ọrụ Ndị Ozi 2

Devid kwuru banyere ya, “ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji.

Acts 2:25 (UKJV) For David speaks concerning him, I foresaw the Lord always before my face, for he is on my right hand, that I should not be moved:

23Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu.

24Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya.

25Devid kwuru banyere ya, “ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji.

26Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ; anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya,

27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.