30Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
31Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.
32Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya.
33Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.
34Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m,