29“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa.
30Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
31Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.
32Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya.
33Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.