27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.
28I mere ka m mara ụzọ nke ndụ; ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’
29“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa.
30Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
31Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.