35ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’
36“Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
37Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha sịrị Pita na ndị ozi ndị ọzọ, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
38Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
39Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.”