37Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha sịrị Pita na ndị ozi ndị ọzọ, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
38Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
39Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.”
40O jiri ọtụtụ okwu ndị ọzọ gbaa ama, ma dụọkwa ha ọdụ sị, “Sitenụ nʼetiti ọgbọ a jọrọ njọ zọpụta onwe unu.”
41E mere ndị nabatara okwu ya baptizim, ha dị ihe ruru puku mmadụ atọ, a gụnyere nʼọnụọgụgụ ha.