42Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere.
43Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche.
44Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ.
45Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.
46Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.