44Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ.
45Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.
46Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.
47Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.