Ọrụ Ndị Ozi 2

Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche?

Acts 2:8 (UKJV) And how hear we every man in our own tongue, wherein we were born?

6Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche.

7Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili?

8Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche?

9Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa,

10ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.