7Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili?
8Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche?
9Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa,
10ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa
11(ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.”