9Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa,
10ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa
11(ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.”
12O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụ?”
13Ma ụfọdụ ndị ọzọ na-akwa ha emo na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”